Abụ Ọma 100:1-5
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
Kpelee Onyenwe anyị, Chineke dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide
Copyright (c) 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica, Inc. CC BY-SA 4.0.
1Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.
2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya
3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya.
5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.