Abụ Ọma 120:1-7

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

Onye odeakwulu na-akpọ Onyenwe anyị azọpụta ya pụọ n'aka ndị na-ekwu okwu ụgha. O na-atụ egwu ọnwụ

Copyright (c) 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica, Inc. CC BY-SA 4.0.

1Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m.

2O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ.

3Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ?

4Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.

5Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!

6Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị.

7Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.