Abụ Ọma 123:1-4
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
Onye oyi na-achọ enyemaka Chineke. Ndị oyi na-elekọta Onyenwe anya
Copyright (c) 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica, Inc. CC BY-SA 4.0.
1Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.
2Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.
3Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
4Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.