Abụ Ọma 125:1-5

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

Onyenwe anyị na-echebe ndị ya. Ndị ezi omume ga-enwe ihe ọma.

Copyright (c) 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica, Inc. CC BY-SA 4.0.

1Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

2Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.

3Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.

4O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.

5Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ka udo dịrị Izrel.