Abụ Ọma 128:1-6

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

Abụ Ọma 128 na-ekwu banyere ngọzị na ihe ịga nke ọma nke ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị. Ha na-eri mkpụrụ ọrụ aka ha.

Copyright (c) 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica, Inc. CC BY-SA 4.0.

1Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.

2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.

3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.

4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.

5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,

6ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.