Abụ Ọma 131:1-3
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
Onye na-akọwa ụjọ ya na Chineke. O na-ekpe okpukpe
Copyright (c) 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica, Inc. CC BY-SA 4.0.
1O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m, ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m; adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ; dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ, e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.