Abụ Ọma 134:1-3

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

Toonu Onyenwe anyị

Copyright (c) 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica, Inc. CC BY-SA 4.0.

1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị.

2Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya ma toonu Onyenwe anyị.

3Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa site na Zayọn gọzie unu.