Abụ Ọma 49:1-20
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
Abụ Ọma 49 na-ekwusi ike na ịnwụ bụ akụkụ nke ndụ, ma o wughị akụnụba. Ndị mmadụ kwesịrị ịtụkwasị obi na Chineke.
Copyright (c) 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica, Inc. CC BY-SA 4.0.
1Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile! Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa,
2ma ndị dị ala ma ndị dị elu, ma onye ọgaranya ma onye ogbenye.
3Aga m ekwu okwu amamihe, ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.
4Aga m aṅa ntị nye ilu, aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m.
5Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,
6ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha.
7O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ, maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ,
8nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,
9nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi, ma hapụ ịnwụ.
10Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ, ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa, si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.
11Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi, ebe obibi ha ruo ọgbọ niile nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha.
12Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ, dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa.
13Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha, na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Sela
14Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha, ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ, ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ. Ozu ha ga-erekasị nʼime ili nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha.
15Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili, nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela
16Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,
17nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ, ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.
18Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,
19ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.
20Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.