1 Ihe E Mere 1:1-54

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Adam, Set, Enọsh,

2Kenan, Mahalalel, Jared,

3Enọk, Metusela, Lamek, na Noa.

4Ụmụ Noa bụ Shem, Ham, na Jafet.

5Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.

6Ụmụ ndị ikom Goma bụ Ashkenaz, na Rifat, na Togama.

7Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim, na Rodanim.

8Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.

9Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama, na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.

10Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.

11Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,

12ndị Patrus, na ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.

13Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,

14ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,

15ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,

16ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat.

17Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram. Ụmụ Aram bụ Uz, Hul, Geta na Meshek.

18Apakshad bụ nna Shela; Shela bụrụ nna Eba.

19Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa; aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.

20Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,

21Hadoram, Ụzal, Dikla,

22Obal, Abimael, Sheba,

23Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.

24Shem, Apakshad, Shela,

25Eba, Peleg, Reu,

26Serug, Nahọ, Tera

27na Ebram, ya bụ Ebraham.

28Ụmụ Ebraham mụrụ bụ Aịzik na Ishmel.

29Ndị a bụ ụmụ ụmụ ha: Nebaiot (ọkpara Ishmel), Keda, Adbel, Mibsam,

30Mishma, Duma, Masa, Hadad, Tema,

31Jetua, Nafish na Kedema. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ishmel.

32Ketura, iko nwanyị Ebraham, mụtaara ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua. Jokshan mụtara ndị a: Sheba na Dedan.

33Ụmụ ndị ikom Midian bụ: Efaa, Efe, Hanok, Abida na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Ketura.

34Ebraham mụtara Aịzik. Ụmụ ndị ikom Aịzik bụ Ịsọ na Izrel.

35Ịsọ mụrụ ndị a: Elifaz, Reuel, Jeush, Jalam na Kora.

36Ụmụ Elifaz bụ Teman, Ọmaa, Zefi, Gatam na Kenaz, na Amalek, site na Timna.

37Ụmụ ndị ikom Reuel bụ: Nahat, Zera, Shama, na Miza.

38Ụmụ ndị ikom Sia bụ Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana, Dishọn, Eza na Dishan.

39Ụmụ ndị ikom Lotan bụ Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.

40Ụmụ ndị ikom Shobal bụ Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam. Zibiọn mụrụ Aịa na Ana.

41Ana mụrụ Dishọn. Ụmụ Dishọn bụ Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran.

42Ụmụ ndị ikom Eza bụ Bilhan, na Zaavan, na Akan. Ụmụ ndị ikom Dishan bụ Uz na Aran.

43Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze nke ha. Bela nwa Beoa, onye aha obodo ya bụ Dinhaba.

44Mgbe Bela nwụrụ Jobab nwa Zera, onye Bozra nọchiri ya dịka eze.

45Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.

46Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị agha Midia nʼọzara Moab, ghọrọ eze. Isi obodo ya bụ Avit.

47Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.

48Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.

49Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa, nọchiri ya dịka eze.

50Mgbe Baal-Hanan nwụrụ, Hadad nọchiri ya dịka eze. Akpọrọ isi obodo ya Pai. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred, nwa nwa Mezahab.

51Hadad mesịrị nwụọkwa. Ndịisi ọnụmara nʼEdọm bụ Timna, Alva, Jetet,

52Oholibama, Elaa, Pinon,

53Kenaz, Teman, Mibza,

54Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm.