Job 10:1-22

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1“Ike ịdị ndụ agwụla m. Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi, kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.

2Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe, kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.

3Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m, si otu a leda ọrụ aka gị anya, mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?

4Ị nwere anya nke anụ ahụ? Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?

5Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ, ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?

6Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m ma nyochaa mmehie m?

7Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m, na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.

8“Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m. Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?

9Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ. Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?

10Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?

11Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ, werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?

12I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị, nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.

13“Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị, amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.

14Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya, ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.

15Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m! A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu nʼihi na ejupụtara m nʼihere, bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.

16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m.

17I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.

18“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.

19A sịkwarị na amụpụtaghị m maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!

20Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole? Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,

21tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ ebe m na-agaghị esi pụtakwa.

22Nʼala nke oke ọchịchịrị, ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị, ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”