Job 12:1-25

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Mgbe ahụ, Job zara:

2“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe, unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.

3Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?

4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!

5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.

6Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.

7“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.

8Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.

9Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?

10Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ

11Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu, otu ire si anwale ihe oriri?

12Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?

13“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike, ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.

14Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.

15Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa. Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.

16Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.

17Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha, ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.

18Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere, ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.

19Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha, kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.

20Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi, wepụkwa nghọta nke ndị okenye.

21Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị, napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.

22Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.

23Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi; Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.

24Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha, zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.

25Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè. Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.