Job 17:1-16

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Mmụọ m tiwara etiwa, ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ, ili na-echere ịnabata m.

2Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu; anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.

3“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?

4I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta; ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.

5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya, anya ụmụ ya ga-ada mba.

6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla, meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.

7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.

8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.

9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha, ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.

10“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ! Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.

11Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi. Ma ọchịchọ nke obi m

12na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie; nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.

13Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,

14a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’ maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’

15ebeekwa ka olileanya m dị? Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?

16Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”