Job 20:1-29

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

2“Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.

3Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m, ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.

4“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.

5Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.

6Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;

7ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’

8Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.

9Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ, ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.

10Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.

11Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.

12“Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ, na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;

13ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya, ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,

14ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya, ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.

15Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara; Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.

16Ọ ga-amịcha elo agwọ, eze agwọ ajụala ga-egbu ya.

17Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi, bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.

18Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu. Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.

19Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla, ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.

20“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya; ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.

21Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa, ọganihu ya agaghị adịgide.

22Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.

23Mgbe o rijuru afọ ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya, iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.

24Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga, àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.

25Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya, site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma. Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.

26Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya, ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.

27Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya ụwa niile ga-ebili megide ya.

28Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya; oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.

29Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu, ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”