Job 8:1-22

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:

2“Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a? Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.

3Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?

4Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya, o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.

5Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike, rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,

6ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi, ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.

7Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala, ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.

8“Jụọ ọgbọ ndị gara aga ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.

9Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.

10Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe? Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?

11Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị? Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?

12Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha, ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.

13Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke, otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.

14Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa; ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.

15Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi; ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.

16Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị, nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.

17Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ, ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.

18Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya, ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’

19Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ, site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.

20“Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ, maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.

21Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị. Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.

22Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe, ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”