Maika 2:1-13

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha, na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche. Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara, nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha.

2Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike, na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike. Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha, ha na-ezunara ha ihe nketa ha.

3Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị, “Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.

4Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu, ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị, ‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi, e kesaala ihe nnweta nke ndị m, ọ napụla m ha. O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ”

5Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.

6Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.”

7Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma?

8Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.

9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m site nʼụlọ afọ ojuju ha. Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m ruo mgbe ebighị ebi.

10Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.

11Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị, ‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ.

12“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb, aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe. Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ, dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya, ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.

13Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha. Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee. Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha, Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”