Abụ Ọma 102:1-28

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.

2Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa.

3Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.

4Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m.

5Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.

6Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.

7Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.

8Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.

9Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m

10nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.

11Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.

12Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

13Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola.

14Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.

15Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.

16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.

17Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.

18Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:

19“Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,

20ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”

21Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem,

22mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.

23O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.

24Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

25Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.

26Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.

27Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.

28Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”