Abụ Ọma 104:1-35
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.
2Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu
3na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri. Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.
4O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi, meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.
5Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.
6I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile.
7Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.
8Ha sitere nʼelu ugwu niile, sọrọ gaa na ndagwurugwu, ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.
9Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.
10Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.
11Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.
12Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha; nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.
13Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile; ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.
14Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta;
15mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị, mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma, na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
16A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma, osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.
17Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha; nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.
18Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa; nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.
19I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche; anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.
20Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị; ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.
21Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.
22Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara, ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.
23Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.
24Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.
25Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.
26Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.
27Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.
28Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma.
29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.
30Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.
31Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,
32onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji, onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.
33Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m; aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.
34Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ, dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
35Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m! Toonu Onyenwe anyị!