Abụ Ọma 108:1-13
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
1Obi m dị njikere, o Chineke; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.
2Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
3Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
4Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
5Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
6Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
7Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.
8Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
9Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
10Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
11Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
12Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
13Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.