Abụ Ọma 122:1-9

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”

2Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.

3E wuru Jerusalem dịka obodo a chịkọtara ọnụ nke ọma.

4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.

5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.

6Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: “Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.

7Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”

8Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”

9Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị, aga m achọ ọganihu gị.