Abụ Ọma 128:1-6

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.

2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.

3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.

4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.

5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,

6ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.