Abụ Ọma 13:1-6

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?

2Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?

3Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;

4mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.

5Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.

6Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.