Abụ Ọma 136:1-26
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
3Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
4Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
5Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
6Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
7Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
8Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
9Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
10Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
11O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
12O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
13Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
14Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
15Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
16Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
17Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
18O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
19O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
20Na Ọg eze Bashan, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
21Were ala ha nye dịka ihe nketa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
22O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
23Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
24Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
25Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
26Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.