Abụ Ọma 142:1-7

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa; ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.

2Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya, gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.

3Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m, ọ bụ gị maara ụzọ m. Nʼụzọ ebe m na-esi aga ka ndị mmadụ siiri m ọnya.

4Lee anya nʼaka nri m ma hụ na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m. Enweghị m ebe mgbaba. Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.

5Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị, na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m, oke m nʼala ndị dị ndụ.”

6Gee ntị na mkpu akwa m, nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike; gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ, nʼihi na ha siri ike karịa m.

7Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ, ka m nwee ike too aha gị. Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.