Abụ Ọma 15:1-5

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị? Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị?

2Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, onye na-arụ ọrụ ezi omume, onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.

3Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,

4onye na-eleda onye ajọ omume anya, ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya,

5onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. Onye na-eme ihe ndị a agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.