Abụ Ọma 19:1-14

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.

2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.

3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha.

4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.

5Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.

6Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.

7Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.

8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.

9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi.

10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.

11Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.

12Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.

13Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị. Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m. Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke, onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.

14Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.