Abụ Ọma 25:1-22

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Ọ bụ na gị Onyenwe anyị ka m tụkwasịrị obi m.

2O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m.

3Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.

4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile.

5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.

6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.

7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.

8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.

9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

10Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.

11Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.

12Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.

13Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.

14Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.

15Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.

16Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.

17Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute.

18Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile.

19Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị.

20Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ

21Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.

22O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.