Abụ Ọma 31:1-24

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m.

2Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.

3Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.

4Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.

5Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.

6Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru; ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m.

7Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, nʼihi na ị hụrụ nsogbu m marakwa ihe mgbu nke mmụọ m.

8I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m, kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.

9O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m. Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa; ike adịghịkwa m.

10Iru ụjụ eriela m ahụ; ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m; ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.

11Nʼihi ndị iro m niile; ndị agbataobi m na-elelị m anya. Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.

12Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.

13Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.

14Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.”

15Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.

16Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.

17O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu.

18Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam; nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.

19Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ.

20I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.

21Otuto dịrị Onyenwe anyị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.

22Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.

23Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.

24Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.