Abụ Ọma 51:1-19

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile.

2Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha.

3Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.

4Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.

5Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.

6Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.

7Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.

8Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.

9Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile.

10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.

11Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.

12Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m.

13Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.

14O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.

15O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.

16Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.

17Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.

18Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.

19Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.