Abụ Ọma 67:1-7
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
1Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela
2Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.
3Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
4Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela
5Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
6Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.
7Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.