Abụ Ọma 71:1-24
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
1Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m.
2Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.
3Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.
4O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.
5Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.
6Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị.
7Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.
8Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.
9Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.
10Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.
11Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ; chụọ ya ọsọ, jidekwa ya, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”
12O Chineke, anọla m ebe dị anya; O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.
13Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.
14Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.
15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.
16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.
17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.
18O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.
19O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. O Chineke, onye dị ka gị?
20Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu nke dị ilu, ị ga-atụte ndụ m ọzọ; site nʼebe dị omimi nke ụwa, ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.
21Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.
22O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị, nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, gị Onye nsọ nke Izrel.
23Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m na-abụku gị abụ otuto, mụ, onye ị gbapụtara.
24Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta ọrụ ezi omume gị niile, nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ, ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.