Abụ Ọma 88:1-18
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m, nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.
2Ka ekpere m bịa nʼihu gị. Chee ntị gị nụrụ akwa m.
3Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ.
4Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike.
5A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.
6Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.
7Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela
8Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya, mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ. Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;
9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
10ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị? Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? Sela
11Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?
12A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?
13Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.
14O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m? Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?
15Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.
16Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; ihe egwu gị alaala m nʼiyi.
17Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.
18Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya; ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.