Job 23:1-17

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Mgbe ahụ, Job zara sị:

2“Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu; aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.

3A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya; a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!

4Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.

5Aga m achọpụta ihe o ga-aza m ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.

6Ọ ga-eji ike dị egwu megide m? Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.

7Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya. Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.

8“Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ; ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.

9Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya, mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.

10Ma ọ maara ụzọ m na-aga, mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,

11ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.

12Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m; a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.

13“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.

14Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m, ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.

15Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya; mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.

16Chineke emeela ka obi m daa mba; Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.

17Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m, bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.