Job 24:1-25
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
1“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe? Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a?
2Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala, na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi.
3Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei, ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.
4Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa. Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.
5Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara, otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri, ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.
6Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi, na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.
7Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị, ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi.
8Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ, ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.
9Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara. Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe.
10Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị, ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.
11Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya, ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.
12Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili, mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka. Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.
13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè, ndị na-amaghị ụzọ ya maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.
14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.
15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji; ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ ọ na-ekpuchikwa ihu ya.
16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.
17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha, ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.
18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.
19Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike.
20Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi.
21Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa, ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.
22Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.
23Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.
24A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị, a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ, a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.
25“Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”