Abụ Ọma 118:1-29
Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)
1Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
3Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
4Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
5Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.
6Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
7Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.
8Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
9Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
10Mba niile gbara m gburugburu ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.
11Ha gbara m gburugburu, ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.
12Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.
13Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, ma Onyenwe anyị nyere m aka.
14Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m.
15Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!
16Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”
17Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.
18Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.
19Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.
20Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.
21Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m.
22Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ;
23nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.
24Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
25O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.
26Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.
27Onyenwe anyị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja.
28Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.
29Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.