Abụ Ọma 62:1-12

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike. Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.

2Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m; ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

3Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a? Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya, ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?

4Ha ekpebiela isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya; okwu ụgha na-atọ ha ụtọ. Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi, ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela

5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa.

6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

7Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke, Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.

8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela

9Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume, ndị ukwu bụ naanị ụgha; ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu; ha niile bụ naanị otu nkuume.

10Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego, maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu; akụ unu nwere ike mụbaa, unu atụkwasịla ha obi.

11Chineke ekwuola otu ihe, ihe abụọ ka m nụrụ: “Na gị, O Chineke, dị ike,

12na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya. Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya si dị.”