Abụ Ọma 63:1-11

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.

2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị.

3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.

4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.

5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.

6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.

7Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.

8Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m.

9A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.

10A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.

11Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.