Abụ nke Abụ 2:1-17

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn, na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.

2E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu, otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.

3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.

4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.

5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.

6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.

7Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị: Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta, ruo mgbe ọ masịrị ya.

8Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya! Lee ya ka ọ na-abịa, na-amali elu nʼelu ugwu niile, na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.

9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele. Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị, ọ na-esikwa na oghereikuku na nʼoghere dị ya na-elebata anya.

10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, “Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, onye m mara mma, soro m.

11Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala.

12Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile.

13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ, isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”

14Nduru m nọ nʼọgba nkume, nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu, gosi m ihu gị, mee ka m nụ olu gị, nʼihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma.

15Jidenụ nkịta ọhịa, ụmụ nkịta ọhịa niile na-emebiri anyị ubi, ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.

16Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,

17tutu chi ụtụtụ abọọ mgbe onyinyo niile na-agabigakwa. Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya, dị ka mgbada maọbụ nwa ele nke nọ nʼelu ugwu.