Abụ nke Abụ 3:1-11

Biblica Open Igbo Contemporary Bible (BIUO)

1Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.

2Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.

3Ndị nche na-eche obodo hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?”

4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.

5Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya.

6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?

7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.

8Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị.

9Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.

10Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee; ala ya bụkwa ọlaedo. Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa, e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya. Ndị inyom Jerusalem,

11pụtanụ, bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn, bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze; lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi, nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.